Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu.
Ekpere maka nnapụta
1O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọnke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.7Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m;Ifrem bụ okpu igwe m,Juda bụ mkpara eze m.8Moab bụ efere ịkwọ aka m,aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?Onye ga-edu m gaa Edọm?10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?11Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.12Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.