Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya.
Ekpere maka nnapụta
1O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m,chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe,zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ!Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m,o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m.Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile,gị onye bụ Chineke nke Izrel,kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ;e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela6Nʼanyasị, ha na-alaghachi,na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịtamgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha,ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;ị na-akwa mba ndị a niile emo.9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị;gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.Chineke ga-ebutere m ụzọmekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha,ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu.Were ike gị mee ka ha wagharịa,wedakwaa ha nʼala.12Ka e jide ha nʼime nganga ha,nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta,na nʼihi okwu ọnụ ha.Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,13jiri iwe ọkụ repịa ha,repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ.Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa,na Chineke na-achị Jekọb.14Nʼanyasị ha na-alaghachi;na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta,mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.15Ha na-awagharị na-achọ nri,na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.16Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.17O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,Chineke m, onye m na-adabere.