Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam.
Ahụhụ nke ndị na-emebi iwu
1Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi?O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?2Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu,aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.3Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu;site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.4Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ,na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,5nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya,nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.6O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ;o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!7Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ;mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.8Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya;dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.9Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu,ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.10Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ,mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.11Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị,“Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ;nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”