Abụ Ọma57ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.

Ntụkwasị obi nʼime Chineke

1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbabatutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta mna-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; SelaChineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
5O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
6Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,ihe mgbu nyịturu m.Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela
7Obi m dị njikere, o Chineke,obi m dị njikere sikwaa ike;aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.8Teta nʼụra mkpụrụobi m!Teta, ụbọ akwara na une!Aga m akpọte chi ọbụbọ.
9O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.10Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
11O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.