Abụ Ọma54ibo_bib

Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?”

Ekpere maka nchebe

1O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;jirikwa ike gị kpepụta m.2O Chineke, nụrụ ekpere m;gee ntị nʼokwu ọnụ m.
3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela
4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
5Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.7Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.