Abụ Ọma51ibo_bib

Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko.

Ekpere maka mgbaghara mmehie

1O Chineke, meere m ebere,nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;nʼihi oke ọmịiko gị,hichapụ njehie m niile.2Sachapụ mmehie m niile,ma mee m ka m dị ọcha.
3Nʼihi na amaara m njehie m niile,mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.5Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.6Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
7Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha;sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.8Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.9Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,hichapụkwa mmehie m niile.
10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.11Achụpụla m nʼihu gị,anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
13Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.14O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m,ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,ka m kwupụta otuto gị.16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,O Chineke, ị naghị elefu anya,nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
18Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu;i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.19Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja,aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ;mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.