1Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile!Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,2ma ndị dị ala ma ndị dị elu,ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.3Aga m ekwu okwu amamihe,ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.4Aga m aṅa ntị nye ilu,aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara,mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba hama na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ,maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ,o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi,ma hapụ ịnwụ.10Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ,ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa,si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.11Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi,ebe obibi ha ruo ọgbọ niilenʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.12Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ,dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.13Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha,na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.Ozu ha ga-erekasị nʼime ilinʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna yandị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.20Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọtadịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.