1Kụọnụ aka unu, unu mba niile;jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.Jirinụ abụ too ya.8Chineke bụ eze mba niile;ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,dịka ndị Chineke nke Ebraham,nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.