Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora.
Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume
1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oririnʼehihie ma nʼabalị,mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,“Olee ebe Chineke gị nọ?”4Ihe ndị a ka m na-echetamgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu hanʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,na-aga nʼụlọ Chineke.5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?Nwee olileanya na Chineke,nʼihi na m ka ga-eto ya,Onye nzọpụta m na Chineke m.6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;ya mere, aga m echeta gịsite nʼala Jọdan,na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmirimgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niileekpuchiela isi m.8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,ekpere nye Chineke nke ndụ m.9Ana m asị Chineke, oke nkume m,“Gịnị mere i ji chefuo m?Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụnʼihi mmegbu nke onye iro?”10Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,“Olee ebe Chineke gị nọ?”11O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?Nwee olileanya na Chineke,nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,Onye nzọpụta m na Chineke m.