Abụ Ọma40ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Abụ ekele

1Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.2O sitere nʼolulu na-amị amị,nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,abụ otuto nye Chineke anyị.Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;onye na-adịghị ele ndị mpako anyamaọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.5O Onyenwe anyị Chineke m,ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niileị kwadooro maka inye anyị;a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọma ị megheela ntị abụọ;aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,iwu gị dị nʼime obi m.”
9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;dịka ị maara, o Onyenwe anyị,anaghị m emechi ọnụ m.10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
11O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,obi m na-adakwa mba nʼime m.13O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
14Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara;ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m,laghachi azụ nʼihere.15Ka ndị ahụ na-asị m,“Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.16Ma ka ndị niile na-achọ gịṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị;ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,“Onyenwe anyị dị ukwuu.”
17Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa;ka Onyenwe anyị cheta m.Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.