Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ.
Ntụgharị uche nke abalị
1Zaa m mgbe m na-akpọku gịChineke m, gị onye ezi omume;Napụta m site nʼihe mgbu m,meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,chụkwaranụ ya aja ezi omume.6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.7Were ọṅụ mejupụta obi mkarịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.