Abụ Ọma39ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.

Nkwupụta mmehie

1Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niilema debe ire m ka m ghara ikwuhie ;aga m eji ihe kechie ọnụ mmgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”2Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu,jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma,oke ihe mgbu m mụbara.3Obi m kporo ọkụ nʼime m,ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
4“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ mna ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.5I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuumeọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela
6“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyonʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.
7“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya?Olileanya m dị nʼime gị.8Zọpụta m site na mmehie m niile;ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.9Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu,nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.10Kwụsị iti m ihe;ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.11Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha;ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla,mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela
12“O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka;emechila ntị gị nye ibe akwa m.Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa,dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.13Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ,tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”