1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị mdịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyinʼihi mmehie enweghị uche m.6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼalaogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuuahụ adịghịkwa m.8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.18Ana m ekwupụta mmehie m;mmehie m na-ewute m.19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.20Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,na-ebo ebubo megide mnʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.21O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.22Bịa ọsịịsọ inyere m akaOnyenwe m na Onye nzọpụta m.