1Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ,maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;2nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa,dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,were ndidi chere ya;echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,na-ata ikekere eze megide ha;13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,kwee ụta haime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa,igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha,kụrisiekwa ụta ha.16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nweredị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.20Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ,ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.26Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,ụmụ ha ga-abụ ngọzị.27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.28Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi.A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi,ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha,ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.30Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha,ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.34Chere Onyenwe anyị,debekwa ụzọ ya.Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.35Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,36ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.37Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama;ọganihu dịịrị onye udo.38Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi;ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.40Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa hama na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.