1E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chinekebanyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:Ọ dịghị ịtụ egwu Chinekedị nʼanya ha.2Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.3Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.4Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.5O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.6Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.7Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.8Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.9Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.10Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.11Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.12Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.