Abụ Ọma35ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ;buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.2Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị;bilie bịa nyere m aka.3Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.Gwa mkpụrụobi m,“Abụ m nzọpụta gị.”
4Mee ka ihere meendị niile na-agbalịsị ike igbu m.Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,na ndị ihere mere.5Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.6Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị;ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
7Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha,ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.8Ka mbibi bịakwasị ha na mberede,ka ụgbụ ha zobeere m kee ha;ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.9Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị,ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.10Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị,“O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị?Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha,ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
11Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asịna ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,na-atakwara m ikikere eze ha.
17O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu,kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche ichemegide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.21Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị,“Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”
22O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị;anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.23Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m.Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.24O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị;ekwekwala ka ha chịa m ọchị.25Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!”Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
26Mee ka ihere na ọgbaagharabụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m;were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe,bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.27Ka ndị niile mkpepụta m dị mmawere obi ụtọ tie mkpu ọṅụ;ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu,onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
28Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gịna otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.