1Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;ekwela ka ihere mee m;site nʼezi omume gị gbapụta m.2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,bịa ngwangwa gbapụta m;ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.4Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.6Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,nʼihi na ị hụrụ nsogbu mmarakwa ihe mgbu nke mmụọ m.8I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.9O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;ike adịghịkwa m.10Iru ụjụ eriela m ahụ;ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa mruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.11Nʼihi ndị iro m niile;ndị agbataobi m na-elelị m anya.Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.12Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.13Anụla m nkwulu ha megide m;oke egwu dị nʼakụkụ niile;ha na-agba izu megide m,na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị.Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”15Oge m niile dị gị nʼaka.Napụta m nʼaka ndị iro mna nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.17O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m,nʼihi na akpọkuola m gị;kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.18Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelịka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.19Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,nʼihu ọha mmadụ.20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gịpụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.21Otuto dịrị Onyenwe anyịnʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuumgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.22Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,“Ewezugala m site nʼihu ya!”Ma ị nụrụ arịrịọ m maka eberemgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.23Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.24Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.