1Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.2O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,ị gwọkwara m.3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,i mere ka m dịrị ndụ.4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,toonu aha nsọ ya.5Iwe ya adịghị adịgide tee anya,ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.6Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m,“Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”7O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma,i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu;ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ,adara m mba.8Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru;ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,9“Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi?Uru gịnị dị ma m rịda nʼili?Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto?Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere;O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.