1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.4Olu Onyenwe anyị dị ike,olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwemgbe amụma na-egbu.8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọna-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.11Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.