1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;gị bụ Oke nkume m,agbala m nkịtị.Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.2Nụrụ arịrịọ m maka eberedịka m na-akpọku gị maka enyemaka,mgbe m chịlịri aka m abụọ elunʼEbe gị Kachasị Nsọ.3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,ma ha bu iro nʼime obi ha.4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ hana omume ha kwesiri;kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,ọ ga-akwada ha nʼala,ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.6Toonu Onyenwe anyị,nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,aga m ejikwa abụ m na-eto ya.8Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.9Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.