1Onyenwe anyị, biko kpepụta m,nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,na-eleghị anya nʼazụ.2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,nyochaa obi m na echiche m.3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.6Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.7Ana m abụkwa abụ ekele,jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,aka nri ha jupụtakwara na ngarị.11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;gbapụta m ma meere m ebere.12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.