Abụ Ọma25ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka odudu na nnapụta

1Ọ bụ na gị Onyenwe anyịka m tụkwasịrị obi m.
2O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m.Ekwela ka ihere mee m,ekwekwala ka ndị iro m merie m.3Ihere agaghị emeonye ọbụla olileanya ya dị na gị,ma ihere ga-eme habụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,kuzikwaara m ụzọ gị niile.5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,olileanya m dị na gị.6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,ya na nnupu isi m niile.Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,na-ezikwa ha ụzọ nke ya.10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.11Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị,gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
12Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị?O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.13Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba,ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.14Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya maraọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.15Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile;nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
16Chee m ihu ma gosi m ebere gị,nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.17Ihe mgbu nke obi m abaala ụba,napụta m site nʼobi mwute.18Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya.Biko, gbaghara m mmehie m niile.19Lee ka ndị iro m si mụbaa,ha ji oke iwe kpọọ m asị.
20Chebe ndụ m ma gbapụta m;ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme,nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ21Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu,nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
22O Chineke, Gbapụtakwa Izrel,site na nsogbu ya niile.