1Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,3ọ na-atụte mkpụrụobi m.Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omumenʼihi aha ya.4A sịkwarị na m na-aga ije,na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;nʼihi na ị nọnyeere m,mkpọrọ gị na mkpanaka gịna-akasị m obi.5Ị na-akwado tebul nʼihu m,nʼanya ndị iro m.I tere isi m mmanụiko m na-ejubiga oke.6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso mogologo ụbọchị niile nke ndụ m,m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyịmgbe niile ebighị ebi.