Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid.
Akwa na abụ ekele
1Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?2O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.3Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;ị bụ otuto ndị Izrel.4Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.5Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.6Abụ m idide, abụghị m mmadụ;onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.Ya napụta ya ebe ọ bụna ihe ya masịrị ya.”9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.11Anọla m ebe dị anya,nʼihi na nsogbu dị nso.Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịaasaghepụla ọnụ ha megide m.14A wụpụla m dịka mmiri,ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.Obi m agbazela dịka mmanụ,obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,ha adupuola m aka m na ụkwụ m.17A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị18Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,ha sitere nʼife nza kee uwe m.19Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.20Napụta ndụ m site na mma agha,site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.21Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,zọpụta m site na mpi atụ ndị a.22Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.23Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!24Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anyamaọbụ kwaa ya emo;o lefughị ya anyakama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto yaka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,ma laghachikwute Onyenwe anyị.Ezinaụlọ nke mba niile dị iche ichega-akpọ isiala nʼihu ya.28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,ọ na-achịkwa mba niile.29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.31Ha ga-ekwusa ezi omume yanye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghịnʼihi na o meela ya.