1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,ma site na Zayọn kwagide gị.3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.6Ugbu a, amaara mna Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,zọpụta ma zakwaa ya.7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.9O Onyenwe anyị, zọpụta eze!Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!