Abụ Ọma19ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Akaọrụ Chineke na iwu ya

1Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,ma a na-anụ ụda ha.4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
7Iwu Onyenwe anyị zuruoke;ọ na-eweghachi mkpụrụobi.Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,ọ na-enye anya ìhè.9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,karịa ọlaedo a nụchara anụcha;ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile?Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.13Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị.Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m.Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke,onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
14Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m,ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile,bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.