Abụ Ọma144ibo_bib

Abụ Ọma nke Devid.

Abụ nke dike nʼagha

1Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.
3O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?4Mmadụ dị ka otu nkuume;ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.
5O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.6Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile;gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.7Site nʼelu setịpụ aka gị;gbapụta m, napụtakwa msite nʼoke osimiri,site nʼaka ndị si mba ọzọ,8ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ.Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;10gị onye na-enye ndị eze mmeri,onye na-agbapụta ohu ya Devid.Site na mma agha dị njọ11gbapụta m;napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
12Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apịe ji achọ ụlọeze mma.13Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriridị iche iche si nʼubi anyị.Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;14igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.