Abụ Ọma143ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara;nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị,bịa nyere m aka.2Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe,nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.3Onye iro na-achụ m ọsọ,ọ na-azọpịa ndụ m nʼala;na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị,dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.4Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime mụjọ jupụtakwara m nʼobi.5Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga;ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niilena-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.6Ana m agbasa aka m abụọ nye gị;agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela
7O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ;mmụọ m na-ada mba.Ezonarịla m ihu gị,ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.8Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.9O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m,nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.10Kuziere m ime uche gị,nʼihi na ị bụ Chineke m;ka ezi Mmụọ gịduo m nʼala dị larịị.
11O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m;nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.12Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m;laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi,nʼihi na abụ m ohu gị.