Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere.
Ekpere nke onye mkpọrọ
1Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa;ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,ọ bụ gị maara ụzọ m.Nʼụzọ ebe m na-esi agaka ndị mmadụ siiri m ọnya.4Lee anya nʼaka nri m ma hụna ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.Enweghị m ebe mgbaba.Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,oke m nʼala ndị dị ndụ.”6Gee ntị na mkpu akwa m,nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,nʼihi na ha siri ike karịa m.7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,ka m nwee ike too aha gị.Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburunʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.