Abụ Ọma141ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Arịrịọ nke ezi mmadụ

1O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.
3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,isonye ndị na-eme ihe ọjọọrụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche;ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.
5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m.Isi m agaghị ajụ ya.Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
6A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha,mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.7Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala,otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”
8Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyịnʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.9Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri,sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.10Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha,ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.