1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi hana-akpali agha ụbọchị niile.3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,ndị na-eche echiche ọdịda m.5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela6A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na ngangaka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenyena-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.13Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.