1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ;ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.2Onyenwe anyị sitere nʼeluigwena-ele ụmụ mmadụ anyaịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọtaonye nke na-achọ Chineke.3Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.6Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye,ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.7A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!