1O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dịaga m etokwa aha gịnʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị,nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gịdị elu karịa ihe niile.3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,ị na-echebe ndụ m;ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,ị na-eji aka nri gị zọpụta m.8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,ahapụkwala ọrụ aka gị niile.