Abụ Ọma137ibo_bib

Abụ ndị a dọtara nʼagha

1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwamgbe anyị chetara Zayọn.2Ọ bụ nʼosisi pọplaka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyịebe anyị nọ nʼala ọzọ?5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,ka aka nri m chefuo ǹka ya.6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echichebanyere Jerusalem, oke ọṅụ m,ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm merenʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gịnʼihi ihe i mere anyị,9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ aratụpịa ha nʼelu nkume.