1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.20Na Ọg eze Bashan,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.21Were ala ha nye dịka ihe nketa,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.