Abụ Ọma132ibo_bib

Abụ nrigo.

Devid na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị

1O Onyenwe anyị, cheta Devid,nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.
2Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị,kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:3“Agaghị m abanye nʼime ụlọ mmaọbụ rigoo nʼihe ndina m,4agaghị m arahụ ụra,egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,5tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
6Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata,anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.7“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya;ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.8‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị,gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.9Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe;ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ”
10Nʼihi ohu gị, bụ Devid,agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
11Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu,bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ:“Otu nʼime ụmụ gị,ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,12ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ mna ụkpụrụ niile m kuziri ha,mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ alanʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn,ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi,ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya;aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe,ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
17“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devidma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.18Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwema aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”