Abụ Ọma130ibo_bib

Abụ nrigo.

Mkpụrụobi na-ele anya Chineke

1O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.2Onyenwe anyị, nụrụ olu m.Ka ntị gị na-aṅakwa ntịnʼolu arịrịọ m, maka amara.
3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị;ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyịkarịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrelsite na mmehie ya niile.