Abụ Ọma13ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Ekpere maka nnapụta

1Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?2Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgbanọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.