Abụ Ọma128ibo_bib

Abụ nrigo.

Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

1Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnịna-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi olivgburugburu tebul gị.4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụna-atụ egwu Onyenwe anyị.
5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọnụbọchị niile nke ndụ gị;ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.Ka udo dịrị Izrel.