Abụ Ọma126ibo_bib

Abụ nrigo.

Abụ ekele maka mgbapụta

1Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.2Ọchị juru anyị ọnụ,abụ ọṅụ jukwara anyị ire.Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,“Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.6Onye ji ịkwa akwaburu mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,mgbe ha bu ukwu ọka ha.