Abụ Ọma125ibo_bib

Abụ nrigo.

Chineke onye na-echebe ndị ya

1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọnnke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburuugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgidenʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,nʼihi na ndị ezi omume nwere ikeitinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.
4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọna ndị niile na-eme ajọ ihe.Ka udo dịrị Izrel.