Abụ Ọma
124
/
ibo_bib
Abụ nrigo. Nke Devid.
Ekele maka mgbapụta
1
A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,
ka Izrel kwuo,
2
a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,
mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
3
mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị,
ha gaara eloda anyị na ndụ;
4
idee mmiri gaara iri anyị,
oke mmiri gaara ebufu anyị,
5
ebili mmiri niile
gaara ebufu anyị.
6
Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị
ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
7
Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si
gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya;
ọnya ahụ agbajiela,
anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
8
Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị,
onye kere eluigwe na ụwa.
Powered by Seed Bible API
expand_more
Search
All books
Old Testament
New Testament
chevron_left
Previous Chapter
Books
search
Search
explore
Discover
share
Share
chevron_right
Next Chapter