Abụ Ọma124ibo_bib

Abụ nrigo. Nke Devid.

Ekele maka mgbapụta

1A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,ka Izrel kwuo,2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị,ha gaara eloda anyị na ndụ;4idee mmiri gaara iri anyị,oke mmiri gaara ebufu anyị,5ebili mmiri niilegaara ebufu anyị.
6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghịka ha jiri eze ha dọrie anyị.7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ sigbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya;ọnya ahụ agbajiela,anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị,onye kere eluigwe na ụwa.