Abụ Ọma121ibo_bib

Abụ nrigo.

Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

1Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?2Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,onye kere eluigwe na ụwa bịa.
3Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;4nʼezie onye na-eche Izrel ncheadịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
5Onyenwe anyị na-eche gị nche,Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;6anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.
7Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.8Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.