1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,ọ na-azakwa m.2O Onyenwe anyị, zọpụta msite nʼegbugbere ọnụ okwu ụghana ire na-ekwu okwu aghụghọ.3Gịnị ka a ga-eme gị,ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,gị ire aghụghọ?4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!6Ogologo ogeka m binyere ndị kpọrọ udo asị.7Abụ m onye udo;ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.