Abụ Ọma119ibo_bib
1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla,ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ yama jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.3Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla;ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.4I doola ụkpụrụndị a ga-erubekwara isi.5Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ikena-erube isi nye iwu gị niile!6Mgbe ahụ, ihere agaghị eme mmgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.7Aga m eji obi ziri ezi too gịdịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.8Aga m erubere iwu gị niile isi;biko ahapụkwala m.9Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.11Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,igbochi m imehie imegide gị.12Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;kuziere m iwu gị niile.13Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịaiwu niile nke si nʼọnụ gị.14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niiledịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.15Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gịna-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.16Iwu gị na-amasị m;agaghị m elefu okwu gị anya.17Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ;aga m erubere okwu gị isi.18Kpughee anya m abụọka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.19Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa;ezonarịla m iwu gị niile.20Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niilena-agụ mkpụrụobi m agụụ.21Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụna ndị na-anaghị agbaso iwu gị.22Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị,nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.23Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m,ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m;ha bụ ndị ndụmọdụ m.25Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu;kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.26Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m;ugbu a, kuziere m iwu gị.27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị;ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.28Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;gbaa m ume dịka okwu gị si dị.29Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile;site nʼiwu gị meere m amara.30Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.31O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike;ekwela ka ihere mee m.32Aga m agbaso iwu gị niilenʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.33O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile;mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gịma jiri obi m niile rubere ya isi.35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile,nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niileọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.37Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru;chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.38Mezuo nkwa i kwere ohu gị,ka a tụọ egwu gị.39Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya,nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.40Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike!Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m,nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị,nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu,nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isiruo mgbe ebighị ebi.45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwenʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.46Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị ezema ihere agaghị eme m,47nʼihi na iwu gị na-amasị mnʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.48Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.49Cheta okwu i nyere ohu gị,nʼihi na i nyela m olileanya.50Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:nkwa gị na-echebe ndụ m.51Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka,ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.52O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie,ha na-ewetara m nkasiobi.53Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume,ndị gbakụtara iwu gị azụ.54Iwu gị niile bụ isi okwu abụ mebe ọbụla m na-anọ.55Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị,aga m edebekwa iwu gị.56Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile:ana m erubere ụkpụrụ gị isi.57O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m;ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.58Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị;meere m ebere dịka nkwa gị si dị.59Echeela m echiche banyere ụzọ m niile,chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.60Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu ogeirubere iwu gị niile isi.61A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ,agaghị m echefu iwu gị.62Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekelenʼihi iwu gị niile ziri ezi.63Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.64O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị;kuziere m iwu gị niile.65Meere ohu gị ihe ọmadịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezinʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.67Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m,ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.68I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi;kuziere m iwu gị niile.69Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m,ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.70Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha,ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.71Ọ dị mma na m tara ahụhụka m nwee ike mụta iwu gị niile.72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye mkarịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.73Aka gị kere m, kpụọkwa m;nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.74Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m,nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi,ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ,nʼihi na iwu gị na-amasị m.78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere;ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.79Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m,ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile,ka ihere ghara ime m.81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị,ma olileanya m dị nʼokwu gị.82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị;ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ,anaghị m echefu iwu gị niile.84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche?Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?85Ndị mpako na-egwuru m olulu,bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.86Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi;nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.87Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi,ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.88Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m,ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.89O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.90Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike,nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.92A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m,agaara m anwụ nʼime nsogbu m.93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị;achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.95Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi,ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.96Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke,ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.97O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.98Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,ha na-anọnyere m oge niile.99Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.100Enwere m nghọta karịa ndị okenyenʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.101Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụlaka m nwee ike rubere okwu gị isi102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile,nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ,ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile;ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ mbụrụkwa ìhè nʼụzọ m.106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike,na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.107Ataala m ahụhụ nke ukwuu;chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m,kuziekwara m iwu gị niile.109Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile,ma echezọghị m iwu gị.110Ndị ajọ omume esielera m ọnya,ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi;ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gịruo na ngwụcha.113Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị,ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.114Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m;olileanya m dị nʼokwu gị.115Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!116Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ;ekwekwala ka olileanya m daa.117Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara;aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.118Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị,nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.119Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu;nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.120Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị;ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.121Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.122Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.123Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gịebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.124Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dịma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.125Abụ m ohu gị, nye m nghọta,ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.126O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,nʼihi na a na-emebi iwu gị.127Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanyakarịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,128nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.129Iwu gị niile dị ịtụnanya;ya mere, ana m erubere ha isi.130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,na-achọsi iwu gị niile ike.132Chee m ihu, meere m ebere,dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;ekwela ka mmehie chịa m.134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,ka m nwee ike debe iwu gị.135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.Kuziere m ụkpụrụ gị niile.136Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuunʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.137O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume,iwu gị niile zikwara ezi.138Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;ha kwesiri ntụkwasị obi.139Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.140Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.141Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.142Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.Iwu gị niile bụkwa eziokwu.143Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.144Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.145Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị,aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.146Ana m akpọku gị; zọpụta maga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.147Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;olileanya m dị nʼokwu gị.148Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.149Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.150Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nsoma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.151Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị;ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.152Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.153Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,nʼihi na echefughị m iwu gị.154Kpepụta m, gbapụta m,chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu;chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.159Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.160Okwu gị niile bụ eziokwu;iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.161Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.162Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gịdịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.163Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.164Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,nʼihi iwu gị ziri ezi.165Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.166Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,na-agbasokwa iwu gị niile.167Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isinʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.168Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,nʼihi na ị maara ụzọ m niile.169Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị;nye m nghọta dịka okwu gị si dị.170Ka arịrịọ m ruo gị ntị;gbapụta m dịka nkwa gị si dị.171Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.172Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.173Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.174Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,iwu gị bụ ihe na-amasị m.175Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,ka iwu gị niile gbaa m ume.176Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,chọọ ohu gị,nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.