1Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,2Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ ;4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?7Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,8onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.