Abụ Ọma112ibo_bib

Ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume

1Toonu Onyenwe anyị.Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.
2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.
6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
10Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.