Abụ Ọma11ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Onyenwe anyị ebe mgbaba

1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omumedịka mmiri ozuzo;oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.