Abụ Ọma108ibo_bib

Abụ, Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1Obi m dị njikere, o Chineke;aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.2Teta! Ụbọ akwara na une!Aga m akpọte chi ọbụbọ.3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile;aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;Ifrem bụ okpu igwe m,Juda bụ mkpara eze m.9Moab bụ efere ịkwọ aka m,aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọmnʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?Onye ga-edu m gaa Edọm?11Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị,onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?12Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.13Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.