Abụ Ọma103ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Gọzie Onyenwe anyị

1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;echefukwala mmeso ọma ya niile,3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼoluluwerekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
7O mere ka Mosis mata ụzọ ya,mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,ọ na-echeta na anyị bụ aja.15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa,ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa,adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide sitenʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ yana ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
19Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe,alaeze ya na-achị ihe niile.
20Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya,unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ,na-erubere okwu ya isi.21Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile;unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.22Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niilenʼebe ọbụla ọ na-achị.Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.